Tuesday, February 24, 2009

Igbo Kwenu! Organization

Eji m aka na ihe niile di mmadu niila mma.

Achoro m iji ohere a edee ntakala ihe gbasara ihe m huru n'ama saiba. Ihe m ga-ede agaghi ehi nne. O ga-abu naani ntakala ihe m ga-ede ngwa ngwa. Echi gaara aga (ubochi izu uka nke ato -- Tuesday the 24th) ahuru m otu a na-akpo "Igbo Kwenu!" n'ama saiba. Ihe a na-eme ebe ahu di mma. O masiri m. Ndi otu n'ime otu ahu na-eme otutu ihe gbasara ndi Igbo. Otu ihe na-amasi m bu na ha na-edeputa akwukwo ozi ama saiba kwa onwa. O teela anya ke mgbe ha deputara nke ikpe azu, kama ihe e deela ebe ahu di mma.

Website ha bu http://www.igbokwe.org/ . Gaa, hu ihe ha na-eme ebe ahu.
Ha na-anwakwa ike n'ihe ha na-eme ebe ahu.
"Igbo Kwenu!" Unu Jisienu Ike! Deemenu.

3 comments:

Nice Anon said...

Ihula blogu gia inaghi eme ya update mgbe obula. Ona dikwa mma ime ihe n'usoro n'usoro.

NenyeN said...

Ibia edee ihe ohuru adighi nfe maka na o di otutu ihe m no na-eme mgbe obula, ma aga m agbali.

Unknown said...

Ụbọchị asàà n’ọnwa ìri, n’afọ 2009.

Ihe a na-eme ma ọ bụ a na-ede ebe a dị m mma. Ma ọ ga adị ezi mma ma a na-etinye aha ụbọchị n’ịgụ afọ n’asụsụ Igbo.


Ọ bụ kwa mụ na-anụzi Igbo?


A bụ m.
MathWahr…